Main Article Content

Ọnọdụ ilu igbo n’iduuazị na abụ tony ubesie a họọrọ


Nkoli Mercy Nnyigide

Abstract

Ilu bụ nkaasụsụ pụrụ iche ndị Igbo ji achọ okwu mma. Ọ bara nnukwu uru na ndụ ndị Igbo. Nke a mere e ji kọwaa ya dị ka mmanụ ndị Igbo ji eri okwu. Ha na-eji ya ezipụta echiche, nkwenye, omenala na nhụrụwa ha dị iche iche. Ọtụtụ ndị odee agụmagụ naagbado ụkwụ n’ilu edepụta agụmagụ ha. Anyị chọpụtara na ụfọdụ ndị odee Igbo na-edepụta agụmagụ n’asụsụ Bekee na-agba mbọ iwebata ilu Igbo dị iche iche n’ọrụ ha. Ebumnoobi ha bụ ka a gụnye ọrụ nka ha dị ka agụmagụ Igbo. N’agbanyeghị mbọ ha na-agba n’ime nke a, ọ bụ ihe doro anya na ilu Igbo e webatara n’agụmagụ Igbo na-aka ezipụta echiche na nkwenye ndị Igbo karịa nke e webatara n’agụmagụ Bekee. Ọzọ, nwa nchọcha chọpụtara na ụfọdụ ndị ntorobịa Igbo anaghị enwe mmasị n’ịgụ ụfọdụ akwụkwọ agụmagụ Igbo, ọkachasị nke Tony Ubesie n’oge ugbu a. Ihe kpatara nke a bụ na ha anaghị aghọtacha ilu Igbo dị iche iche o webatara naha. Ka o sila dị, ederede a na-eleba anya n’ụfọdụ ilu Igbo e zipụtaran’akwụkwọ agụmagụ Tony Ubesie a họọrọ, iji chọpụta etu odee a sizipụta ilu ndị ahụ, ọrụ ha na-arụ n’akwụkwọ agụmagụ nakwa uru dị iche iche ha bara. Nwa nchọcha gbadoro ụkwụ n’usoro nkọwa wee zipụta ihe ndị ọ chọpụtara. Site na nchọcha o mere, ihe ndị ọ chọpụtara gụnyere na: Tony Ubesie na-esite n’ilu Igbo dị iche iche akọwapụta omenala na nkwenye ndị Igbo dị iche iche, nka Tony Ubesie ji ewebata ilu Igbo n’ọrụ ya bụ otu ihe na-akwalitekarịcha akanka ya ma mee ka ọ pụọ iche na nke ndị odee ọzọ, Ubesie naagbadokarị ụkwụ n’ilu Igbo enye akwụkwọ agụmagụ ya aha, dgz.


Journal Identifiers


eISSN: 1597-474X