Main Article Content

Mmekọrịta asụsụ na ihe ndị so ya: ileba anya n’ọnọdụ asụsụ igbo na bekee na senchuru nke iri abụọ na otu


Christiana Ngozi Ikegwuonu

Abstract

Asụsụ dị ka eriri ụdọ jikọrọ mba ụwa. Mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-ebutekwa mmekọrịta asụsụ na ibe ya. Mgbe mmadụ na-eme njem azụmahịa n’ebe dị iche iche ma na-akwagharịkwa n’ebe dị iche iche na mba ụwa, mmekọrịta asụsụ na ibe ya na-aga n’ihu maka na ha na-ebu asụsụ na omenaala ha agagharị. Na Naịjirịa, e nwere ọtụtụ agbụrụ dị iche iche na ọtụtụ asụsụ mpunaala dịkwa iche iche ma nwekwa asụsụ mbịambịa bụ asụsụ Bekee, nke bụ asụsụ nwekọ, nke gọọmentị bugoro n’ogo dị elu ka ọ bụrụ nke e ji agbasa ozi ọchịchị na mpaghara dị iche iche, nke mere ka asụsụ a baa ọtụtụ ndị mmadụ n’ụmị ọkpụkpụ. N’ụbọchị taa, ọtụtụ ihe na-esi na mmekọrịta asụsụ na ibe ya apụtazị dị ka o siri pụta ihe na mmekọrịta dị n’etiti asụsụ Igbo na asụsụ Bekee. Ọ bụ n’ihi nke a ka nchọcha a ji eleba anya n’inyocha mmekọrịta asụsụ Igbo na asụsụ Bekee iji chọpụta ihe ndị so ya, na ichepụtakwa ma asụsụ Igbo aka dịkwa etu ọ dị na mbụ, ka o nwere ihe ndị batara na ya ma ọ bụ gbanwere nke metụtara ọsụsụ ya, uru na ọghọm batara na ya. E nwetere ihe ndị e ji dee edemede a site n’ịgba ajụjụọnụ na ige ntị na mkparịtaụka ndị mmadụ. E seere mmadụ ole na ole ọnụọgụ ha dị iri atọ, nke ndị mejupụtara ya gụnyere ndị okenye nwoke, okenye nwaanyị, ndị ntorobịa bido n’agbata afọ iri na ise ruo n’afọ iri asaa. A chọpụtara na o nwere ihe ndị so mmekọrịta a bata n’asụsụ Igbo. Ihe ndị a gụnyere: mbiteokwu, asụmabụọ, adịmabụọ, mmafenye asụsụ, ngwakọ, pijin, asụsụ nkarachọ dịrị gawazie. Uru dị na ya bụ na ọ na-eme ka asụsụ na-eto eto ma ghara ịkwụ otu ebe. A tụnyere aro ka ọha na eze tinye aka n’ịkwalite asụsụ Igbo site n’inye oghere maka nnabata asụsụ ọzọ iji mee ka asụsụ Igbo tozuo n’isonye n’ogo mmepe na-abata site na nkanụụzụ n’oge ugbu a, mana ha agaghị ekwe ka nnabata a napụ ha ịsụ asụsụ Igbo etu o kwesịrị.

Ọkpụrụkpụ mkpụrụokwu: Asụsụ, Mmekọrịta Asụsụ, Mbiteokwu, Asụmabụọ, Adịmabụọ


Journal Identifiers


eISSN: 1597-474X